Psalms 91

Chineke onye na-echebe anyị

1Onye ahụ na-ebi nʼebe mgbaba Onye kachasị ihe niile elu
ga-ezu ike nʼokpuru ndo Onye pụrụ ime ihe niile.
2Nke a ka m ga-ekwu maka Onyenwe anyị, “Ọ bụ ebe mgbaba m na ebe nchebe m e wusiri ike,
Chineke m, onye m na-atụkwasị obi m.”

3Nʼezie, ọ ga-anapụta gị
site nʼọnya nke onye osi ọnya
na site nʼaka ajọ ọrịa na-efe efe na-eweta ịla nʼiyi.
4Ọ ga-eji nku ya kpuchie gị.
Ọ bụkwa nʼokpuru nku ya abụọ, ka ị ga-agbaba zere ndụ,
ikwesi ntụkwasị obi ya ga-echebe gị, ghọkwaara gị ọta.
5Ị gaghị atụ egwu ihe ịtụ oke egwu nke abalị,
maọbụ àkụ na-efegharị nʼehihie,
6maọbụ ajọ ọrịa na-efe efe, nke na-ejegharị nʼọchịchịrị,
ma ọ bụkwanụ ihe mbibi mberede na-eme nʼehihie.
7Puku mmadụ pụrụ ịda nʼakụkụ gị,
iri puku mmadụ nwekwara ike ịda nʼakụkụ aka nri gị,
ma ihe ọjọọ ndị a agaghị erute gị nso.
8Ọ bụ naanị anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ
ntaramahụhụ nke ndị ajọ omume.

9Ọ bụrụ na i mee Onye kachasị ihe niile elu ebe obibi gị,
ọ bụladị Onyenwe anyị, onye bụ ebe mgbaba m,
10mgbe ahụ, ihe ọjọọ ọbụla enweghị ike ịdakwasị gị;
ihe ike ọbụla enweghị ike ịbịaru ụlọ obibi gị nso.
11Nʼihi na ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị,
ka ha chebe gị nʼụzọ gị niile.
12Ha ga-eji ọbụ aka ha,
bulie gị elu ime ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.
13Ị ga-azọkwasị ọdụm na ajụala ụkwụ,
zọgbukwaa ọdụm na-akpa ike, na agwọ ọjọọ.

14“Nʼihi na ọ hụrụ m nʼanya, Mụ onwe m ga-agbapụta ya, ka Onyenwe anyị kwuru;
aga m echebe ya, nʼihi na ọ maara aha m.
15Ọ ga-akpọku m, aga m azakwa ya.
Aga m anọnyere ya nʼime nsogbu ya,
aga m adọpụta, ma sọpụrụkwa ya.
16Aga m eji ogologo ndụ mee ka afọ ju ya,
gosikwa ya nzọpụta m.”
Copyright information for IboBIU